A maara Chineke nʼobodo Juda;
Ụlọ ikwu ya dị na Salem,
Ebe ahụ ka o tijisịrị àkụ niile na-egbu amụma,
Ị jupụtara nʼìhè,
A pụnarịla ndị nwere obi ike ihe ha,
Nʼihi ịba mba gị, O Chineke nke Jekọb,
Ọ bụ naanị gị ka e kwesiri ịtụ egwu.
I sitere nʼeluigwe mee ka a nụ olu ikpe ikpe gị.
mgbe gị, O Chineke, biliri ikpe ikpe,
Nʼezie, oke iwe gị megide ụmụ mmadụ na-ewetara gị otuto,
Kwenụ Onyenwe anyị Chineke nkwa ma mezuokwa ha;
Ọ na-eweda ndị na-achị achị nʼala;